Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 37
  • Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Ista?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Ista?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Ista Ka Ọ Bụ Ememe Ncheta Olee nke I Kwesịrị Ime?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Ista?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Ista Ọ̀ Bụ Ememme Ndị Kraịst n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ànyị Kwesịrị Ime Ememe Okpukpe?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 37

Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Ista?

Ihe Baịbụl kwuru

O nweghị ebe Baịbụl kwuru ka anyị na-agba Ista. Ị gụọ otú Ista si bido, ị ga-aghọta ihe Ista pụtara n’eziokwu. Ọ bụ ememme ndị oge ochie na-emere chi ọmụmụ ma ọ bụ chi na-eme ka ihe ha kọrọ n’ubi mee nke ọma. Lebagodị anya n’ihe ndị a.

  1. Otú e si kpọwa ya Ista: Akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica sịrị: “O nweghị onye ji n’aka ebe ndị Bekee si nweta aha a bụ́ Ista. Otu ụkọchukwu aha ya bụ Venerable Bede sịrị na ọ ga-abụ na e si n’aha chi nwaanyị a na-akpọ Istra nweta ya.” Ndị ọzọ na-ekwukwa na e si n’aha chi nwaanyị ndị Finishia a na-akpọ Astati nweta ya. Ha kweere na ọ bụ chi a na-enye nwa, na-emekwa ka ihe ha kọrọ n’ubi mee nke ọma. Ndị Babịlọn na-akpọ chi a Ishta.

  2. Oké bekee e ji agba Ista: A na-ewere ya na oké bekee na-anọchi anya ọmụmụ. Akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwuru na ‘ebe ndị oge a si mụta iji oké bekee eme ememme Ista bụ n’aka ndị na-ekpeburu arụsị na Yurop na Ijipt na obodo ndị gbara ya gburugburu.’

  3. Àkwá e ji agba Ista: Akwụkwọ a na-akpọ Funk & Wagnalls Standard Dictionary of Folklore, Mythology and Legend, kwuru na egwuregwu ụmụaka na-egwu, ya bụ, ịchọta àkwá Ista ndị e zoro ezo “abụghị egwuregwu nkịtị, kama na ọ bụ ihe a na-eme n’ememme ndị ọgọ mmụọ oge ochie.” Akwụkwọ ọzọ a na-akpọ Traditional Festivals kwuru na obodo ụfọdụ kweere na àkwá Ista ndị a chọrọ mma “nwere ike ime ka mmadụ nwewe obi ụtọ, ihe agawara onye ahụ nke ọma, ahụ́ esie ya ike, ihe ọjọọ agharakwa ime ya.”

  4. Efe ọhụrụ a na-eyi n’oge Ista: Akwụkwọ a na-akpọ The Giant Book of Superstitions kwuru, sị: “E weere ya na mmadụ iyi efe ochie emere chi nwaanyị ndị Skandinevia a na-akpọ Istra ememme bụ mkparị, nakwa na o nwere ike ime ka ihe ọjọọ mee onye ahụ.”

Akwụkwọ a na-akpọ The American Book of Days kwuru hoo haa otú Ista si bido. Ọ sịrị: “O doro ewu na ọkụkọ anya na ndị mbụ kpere chọọchị webatara ememme ndị ọgọ mmụọ na chọọchị, mezie ya ka o yie ememme Ndị Kraịst.”

Baịbụl sịrị ka anyị ghara ịnwa anwa jiri omenala ndị Chineke kpọrọ asị na-efe ya. (Mak 7:6-8) 2 Ndị Kọrịnt 6:17 kwuru, sị, “‘Kewapụnụ onwe unu,’ ka Jehova sịrị, ‘kwụsịkwanụ imetụ ihe na-adịghị ọcha aka.’” Ememme Ista bụ ememme ndị ọgọ mmụọ. N’ihi ya, ndị niile chọrọ ime ihe Chineke na-achọ ekwesịghị ịna-eme ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya