Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 35
  • Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Krismas?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Krismas?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Otú ihe ndị a na-eme n’oge Krismas si bido
  • Krismas—n’Ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Na-eme Ya na Japan?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Krismas—N’ihi Gịnị Ka E Ji Eme Ya Ọbụna n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ndị Kraịst, Hà Kwesịrị Ịna-agba Krismas?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Krismas Ụbọchị Ezumike Ụwa Ka Ọ̀ Bụ Ụbọchị Dị Nsọ nke Okpukpe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 35

Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Krismas?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs, o kwughịkwanụ ka anyị na-eme ememme iji cheta ụbọchị a mụrụ ya. Akwụkwọ a na-akpọ Cyclopedia, nke McClintock na Strong dere kwuru banyere Krismas, sị: “Ememme Krismas esighị n’aka Chineke, o nweghịkwa ebe e kwuru n’A[gba] Ọ[hụrụ] ka anyị na-eme ya.”

Ọ bụrụ na ị saa anya ná mmiri gụọ otú Krismas si bido, ị ga-achọpụta na o si n’ememme ndị ọgọ mmụọ. Baịbụl kwuru na anyị ga-akpasu Chineke iwe ma anyị na-efe ya otú ọ na-achọghị.—Ọpụpụ 32:5-7.

Otú ihe ndị a na-eme n’oge Krismas si bido

  1. Ime ememme maka ụbọchị a mụrụ Jizọs: Akwụkwọ a na-akpọ The World Book Encyclopedia kwuru, sị: “Ndị mbụ soro ụzọ Kraịst emeghị ememme icheta ụbọchị a mụrụ Jizọs maka na ha weere ya na ememme icheta ụbọchị a mụrụ mmadụ bụ ememme ndị ọgọ mmụọ.”

  2. Abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba: E nweghị ihe gosiri na ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka a mụrụ Jizọs. Ọ dị ka ihe mere ndị isi okpukpe ji họrọ ụbọchị ahụ bụ ka ọ daba n’ụbọchị ndị ọgọ mmụọ na-eji eme ememme ha, ya bụ, n’oge oyi ná ngwụcha afọ.

  3. Inyerịta onyinye na ime oriri: Akwụkwọ a na-akpọ The Encyclopedia Americana kwuru, sị: “Ọtụtụ ihe a na-eme n’oge Krismas si n’ememme Satọnelia ndị Rom na-eme n’etiti ọnwa Disemba. Ọ bụ n’ememme a ka e si malite ime oké oriri na nkwari, inye onyinye, na ịmụ kandụl n’oge Krismas.” Akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwukwara na ndị mmadụ “anaghị arụ ọrụ ma ọ bụ zụọ ahịa” n’oge ememme Satọnelia.

  4. Iji ọkụ achọ ụlọ mma n’oge Krismas: Akwụkwọ a na-akpọ The Encyclopedia of Religion kwuru na ndị Yurop na-eji ‘ụdị ọkụ dị iche iche na okooko osisi dị iche iche’ achọ ụlọ ha mma ma ha mewe ememme ha na-eme n’oge oyi. Ha kwekwaara na ihe ndị ahụ na-achụpụrụ ha ndị ajọ mmụọ.

  5. Ahịhịa a na-akpọ mịsụlto na ahịhịa a na-akpọ họlị: Akwụkwọ a na-akpọ The Encyclopedia Americana kwuru na “Ndị Druid kweere na ahịhịa a na-akpọ mịsụlto nwere ikike majik. E nwekwara ndị na-efe ahịhịa a na-akpọ họlị n’ihi na ọ na-eme ka obi sie ha ike na anyanwụ ga-alọghachi ma e nwechaa oge oyi.”

  6. Osisi Krismas: Akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwuru na ‘Ndị Yurop na-ekpere arụsị na-efekarị osisi ofufe, ha akwụsịghịkwa ife ya mgbe ha mechara gawa chọọchị.’ Otu ụzọ ha si eme ya bụ na ha “na-edowekarị osisi Yul n’ọnụ ụzọ ha ma ọ bụ n’ime ụlọ ha ma ha mewe ememme n’oge oyi.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya