Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 74
  • Gịnị Ka Akara 666 Pụtara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Akara 666 Pụtara?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Ịmata Anụ Ọhịa ahụ na Akara Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • 666—Ọ Bụghị Nanị Ihe Omimi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ịlụso Ajọ Anụ Ọhịa Abụọ Ọgụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Nwere Isi Asaa E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 13?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 74
Anụ ọhịa nke nwere isi asaa na mpi iri, nke aha ya ma ọ bụ nọmba ya bụ akara 666.

Gịnị Ka Akara 666 Pụtara?

Ihe Baịbụl kwuru

Akwụkwọ ikpeazụ na Baịbụl kwuru na akara 666 bụ nọmba ma ọ bụ aha otu anụ ọhịa nwere isi asaa na mpi iri nke si n’oké osimiri pụta. (Mkpughe 13:​1, 17, 18) Anụ ọhịa a nọchịrị anya ọchịchị niile dị n’ụwa, bụ́kwa nke na-achị “ebo niile na ndị niile na asụsụ niile na mba niile.” (Mkpughe 13:7) Akara ahụ bụ 666 gosiri na ọchịchị ụwa a kụrụ afọ n’ala kpamkpam n’anya Chineke. Gịnị mere anyị ji kwuo ya?

Ọ bụghị akara nkịtị. Aha ndị Chineke n’onwe ya nyere na-enwe ihe ha pụtara. Dị ka ihe atụ, Chineke nyere Ebram, nke pụtara “Nna Bụ Ihe Ukwu,” aha bụ Ebreham, nke pụtara “Nna nke Ìgwè Mmadụ.” Ọ bụ mgbe Chineke kwere Ebreham nkwa na ya ga-eme ka ọ ghọọ “nna nke ìgwè mba dị iche iche” ka o nyere ya aha ọhụrụ a. (Jenesis 17:5) Otú ahụkwa ka Chineke si nye anụ ọhịa ahụ akara bụ́ 666 ka e jiri ya kọwaa ụdị ihe ọ bụ.

Nọmba bụ́ isii nọchiri anya ihe na-ezughị okè. Ọtụtụ mgbe na Baịbụl a na-eji nọmba anọchi anya ihe. Nọmba bụ́ asaa na-anọchikarị anya ihe zuru okè. Ebe ọ bụ na isii ji otu ghara iru asaa, a na-ejikarị isii akọwa ihe na-ezughị ezu, ma ọ bụ ihe na-ezughị okè n’anya Chineke. A na-ejikwa ya akọwa ndị bụ́ ndị iro Chineke.​—1 Ihe E Mere 20:6; Daniel 3:1.

E kwuru ya ugboro atọ iji mesie okwu ike. Na Baịbụl a chọọ imesi okwu ike, a na-ekwu ya ugboro atọ. (Mkpughe 4:8; 8:13) N’ihi ya, akara ahụ bụ́ 666 na-eme ka anyị ghọta nnọọ na Chineke na-ele ọchịchị ụwa anya ka ihe kụrụ afọ n’ala kpamkpam. Ha enwebeghị ike ime ka e nwee udo ga-adite aka n’ụwa ma ọ bụ ka obi ruo ndị mmadụ ala. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-emeli ihe ndị a.

Akara nke anụ ọhịa

Baịbụl kwuru na ndị mmadụ na-enweta “akara nke anụ ọhịa” n’ihi na ha ji “oké mmasị” na-eso anụ ọhịa ahụ ruo nke na ha na-efe ya ofufe. (Mkpughe 13:​3, 4; 16:2) Otú ha si eme nke a bụ ife mba ha, ihe ndị e ji mara mba ha, na ngwá agha mba ha kwakọbara. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion kwuru, sị: “Mmadụ ịhụ obodo ya n’anya aghọọla ụdị okpukperechi nke ya n’ụwa ugbu a.”a

Olee otú e si aka mmadụ akara anụ ọhịa n’aka nri ma ọ bụ n’egedege ihu? (Mkpughe 13:16) Mgbe Chineke na-enye mba Izrel iwu, ọ sịrị ha: “Keekwa ha n’aka unu dị ka ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa ihe unu ga na-ekegide n’egedege ihu unu.” (Diuterọnọmi 11:18) Ihe ebe a na-ekwu abụghị na ndị Izrel ga-eji ihe kee n’aka ha nakwa n’egedege ihu ha nkịtị, kama ihe ọ pụtara bụ na okwu Chineke ga na-eduzi ma echiche ha ma ihe niile ha na-eme ná ndụ. Otú ahụkwa ka ọ dị akara 666, ọ bụghị akara nkịtị a kanyere n’ahụ́, kama akara anụ ọhịa bụ ihe atụ e ji ama ndị kwere ka ọchịchị ụwa a bụrụ ihe na-eduzi ndụ ha. Ndị nwere akara anụ ọhịa na-eme onwe ha ka ha bụrụ ndị iro Chineke.​—Mkpughe 14:​9, 10; 19:​19-21.

a Gụọkwa Nationalism in a Global Era, peeji nke 134, na Nationalism and the Mind: Essays on Modern Culture, peeji nke 94.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya