Ndịàmà Jehova na Ndị Nọ n’Okpukpe Dị Iche Iche Hà Na-efekọ Chineke Ọnụ?
Ọ na-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ ka ha na ndị mmadụ na-ekwurịta gbasara ihe dị na Baịbụl, mana, anyị na ndị nọ n’okpukpe ọzọ anaghị efekọ Chineke ọnụ. Ihe ọ pụtara bụ na anyị na okpukpe ndị ọzọ kweere n’ihe dị iche iche anaghị efekọ Chineke ọnụ. Baịbụl gosiri na ezi Ndị Kraịst ga-abụ ndị “e jikọrọ ọnụ n’otu.” Ihe ga-eme ka o kwe omume ijikọta ha ọnụ bụ ikwere n’otu ihe. (Ndị Efesọs 4:16; 1 Ndị Kọrịnt 1:10; Ndị Filipaị 2:2) Ikwere n’otu ihe abụghị naanị ịkpa àgwà dị mma ndị dị ka ịhụnanya, ọmịiko na ịgbaghara ndị ọzọ. Ihe ndị anyị kweere bụ eziokwu ndị anyị mụtara na Baịbụl. Ma ọ bụghị ya, ihe ndị anyị kweere enweghị isi.—Ndị Rom 10:2, 3.
Baịbụl ji mmadụ iso ndị ihe ha kweere n’abụghị otu ihe fekọọ Chineke ọnụ tụnyere ikekọta ihe abụọ n’adabaghị adaba. Ime ụdị ihe ahụ ga-eme ka ofufe Onye Kraịst gharazie ịdị ọcha n’anya Chineke. (2 Ndị Kọrịnt 6:14-17) Jizọs ekweghị ka ndị na-eso ụzọ ya na ndị na-ekpe okpukpe ndị ọzọ fekọọ Chineke ọnụ. (Matiu 12:30; Jọn 14:6) Chineke si n’aka Mozis nyekwa ụmụ Izrel Iwu n’oge ochie ka ha ghara isoro ndị agbata obi ha fewe arụsị. (Ọpụpụ 34:11-14) Ndị Izrel na-erubere Chineke isi jụrụ ịnabata enyemaka ndị mba ọzọ chọrọ inyere ha, bụ nke gaara ejikọ ha na ndị n’adịghị efe Chineke.—Ezra 4:1-3.
Ndịàmà Jehova hà na-eso ndị na-aga okpukpe ndị ọzọ na-akparịta ụka?
Ee. N’afọ 2015, anyị ji ihe ruru awa 1,933,473,727 gaa ebe dị iche iche ka anyị na ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche kparịta ụka. Anyị na-eme ka Pọl onyeozi, anyị na-agbalị ghọta otú “ọtụtụ ndị” si eche echiche na ihe ndị ha kweere mgbe anyị na-ezi ha ozi ọma. (1 Ndị Kọrịnt 9:19-22) Mgbe anyị na ha na-akparịta ụka, anyị na-agbalị ka anyị nwee “nkwanye ùgwù dị ukwuu” otú ahụ Baịbụl kwuru, n’ebe onye ahụ anyị na-agwa okwu nọ.—1 Pita 3:15.