Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 136
  • Meri Ọ̀ Bụ Nne nke Chukwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Meri Ọ̀ Bụ Nne nke Chukwu?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl zara
  • Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ̀ Dịwo Mgbe Ọ Bụla Ị Jụrụ?
    Teta!—1996
  • Echiche Ụgha nke 5: Meri Bụ Nne Nke Chukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 136
Meri na nwa ya Jizọs

Meri Ọ̀ Bụ Nne nke Chukwu?

Ihe Baịbụl zara

Mba. Baịbụl anaghị akụzi na Meri bụ nne nke Chukwu, o nweghịkwa ihe o kwuru gosiri na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-efe Meri ma ọ bụ na-akwanyere ya ùgwù pụrụ iche.a Chebagodịrị ihe ndị a echiche:

  • E nweghị mgbe Meri kwuru na ya bụ nne nke Chukwu. Ihe Baịbụl kwuru bụ na Meri bụ nne “Ọkpara Chineke,” ọ bụghị nne Chineke.​—Mak 1:1; Luk 1:​32.

  • E nweghị mgbe Jizọs Kraịst kwuru na Meri bụ nne nke Chukwu ma ọ bụkwanụ na e kwesịrị ịna-akwanyere Meri ùgwù pụrụ iche. Kama nke ahụ, mgbe otu nwaanyị kwuru ihe gosiri na obi kwesịrị ịna-atọ Meri ụtọ n’ihi na ọ bụ nne ọkpara Chineke, Jizọs gbaziri ya olu, gwa ya, sị: “Ee e, kama nke ahụ, obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”​—Luk 11:​27, 28.

  • E nweghị ebe okwu ahụ bụ́ “Nne nke Chukwu” na “Theotokos” (Onye mụrụ Chukwu) dị na Baịbụl.

  • Onye a kpọrọ “Eze Nwaanyị nke Eluigwe” na Baịbụl abụghị Meri, kama ọ bụ chi nwaanyị ndị Izrel ndị hapụrụ Jehova fere n’oge ochie. (Jeremaya 44:​15-19) O nwere ike ịbụ Ishta (Astati), bụ́ chi nwaanyị ndị Babịlọn, bụ ya bụ “Eze Nwaanyị nke Eluigwe.”

  • Ndị Kraịst mbụ efeghị Meri ofufe, ha akwanyereghịkwa ya ùgwù pụrụ iche. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ọ ga-abụ na Ndị Kraịst oge mbụ “ekweghị eso n’òtù nzuzo, o nwekwara ike ịbụ na ha weere ya na ịkwanyere Meri ùgwù pụrụ iche nwere ike ime ka o yie ka hà na-efe chi nwaanyị ofufe.”​—In Quest of the Jewish Mary.

  • Baịbụl kwuru na Chineke dị adị kemgbe. (Abụ Ọma 90:​1, 2; Aịzaya 40:28) Ebe ọ bụ na o nweghị mmalite, o nweghị otú ọ ga-esi nwee nne. Ihe ọzọkwa bụ na o nweghị otú Meri ga-esi buru Chineke n’afọ ya, ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na eluigwe enweghịdị ike ịba ya​—1 Ndị Eze 8:​27.

Meri bụ nne Jizọs ọ bụghị “Nne nke Chukwu”

Meri bụ onye Juu, o sikwa n’ezinụlọ Eze Devid. (Luk 3:​23-​31) O nwetara ihu ọma Chineke n’ihi otú o si nwee okwukwe nakwa n’ihi na ọ na-ejere Chineke ozi. (Luk 1:​28) Chineke họọrọ Meri ka ọ bụrụ nne Jizọs. (Luk 1:​31, 35) Meri na di ya Josef mụtara ụmụ ọzọ.​—Mak 6:3.

Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Meri mechara bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ma e nweghị ọtụtụ ihe ọzọ e kwuru gbasara ya.

Gịnị mere ụfọdụ ndị ji asị na Meri bụ nne nke Chukwu?

Ọ bụ n’ihe dị ka n’agbata afọ 360 na afọ 400 ka a malitere ife Meri ofufe. N’oge ahụ, Chọọchị Katọlik ghọrọ okpukpe Alaeze Ukwu Rom. Nke a mere ka ọtụtụ ndị na-ekpere arụsị ghọọ Ndị Kraịst. Chọọchị Katọlik nabatakwara ozizi Atọ n’Ime Otu na-adịghị na Baịbụl.

Ozizi Atọ n’Ime Otu mere ka ọtụtụ ndị chọọchị a kwuo na ọ bụrụ na Jizọs bụ Chineke, ọ pụtara na Meri bụnụ nne nke Chukwu. N’afọ 431, ndị isi chọọchị ndị zukọrọ n’Efesọs kpọwara Meri “Nne nke Chukwu.” A maliteziri ife Meri ofufe otú kpụ ọkụ n’ọnụ mgbe e nwesịrị nzukọ a n’Efesọs. Ka ọtụtụ ndị na-efebu arụsị na-abakwu chọọchị, ha jizi ihe oyiyi Meri dochie anya chi nwaanyị ọmụmụ ndị ha na-efebu ofufe, dị ka Atemis, (nke ndị Rom bụ Diana) na Isis.

Na 432 C.E., Poopu Sixtus nke Atọ nyere iwu ka a rụọrọ “Nne nke Chukwu” chọọchị na Rom. A rụrụ ya n’akụkụ ebe a rụụrụ Lusina, bụ́ chi nwaanyị ọmụmụ nke ndị Rom, ụlọ nsọ. Otu onye na-ede akwụkwọ kpọrọ ụlọ ụka a “ihe a na-ahụ anya gosiri otú e si gbanweezie Chi Nwaanyị ndị na-ekpere arụsị ya aghọzie Meri mgbe e mechara ka Iso Ụzọ Kraịst ghọzie okpukpe ndị Rom.”​—Mary​—The Complete Resource.

a Ọtụtụ chọọchị na-akụzi na Meri bụ nne nke Chukwu. Ụfọdụ na-akpọ ya “Eze Nwaanyị nke Eluigwe,” ma ọ bụkwanụ Theotokos, nke pụtara “onye mụrụ Chukwu,” n’asụsụ Grik.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya