Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 152
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Iwe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Iwe?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl Zara
  • Ọ̀ọ mgbe niile ka iwe iwe dị njọ?
  • Olee mgbe iwe iwe dị njọ?
  • Olee ihe i nwere ike ime ka ị ghara ịna-ewekarị iwe?
  • Mmadụ Ijide Onwe Ya
    Teta!—2019
  • N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Chịkwaa Iwe Gị?
    Teta!—1997
  • Ekwela Ka Iwe Mee Ka Ị Sụọ Ngọngọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Nghọta Mmadụ Nwere Na-eme Ka Ọ Ghara Iwe Iwe Ọsọ Ọsọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 152
Aka a kwụkwụchiri akwụkwụchi

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Iwe?

Ihe Baịbụl Zara

Baịbụl na-akụzi na iwe ọkụ na-emebi ihe. Ọ na-akpa ma onye na-ewe iwe ọkụ ma ndị nọ ya nso aka ọjọọ. (Ilu 29:22) Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe nwere ike ime ka mmadụ wee iwe mgbe ụfọdụ, Baịbụl kwuru na ndị na-ewe “iwe ọkụ” agaghị eketa Alaeze Chineke. (Ndị Galeshia 5:​19-21) E nwere ihe ndị e kwuru na Baịbụl nwere ike inyere mmadụ aka ịkwụsị ịna-ewe iwe ọkụ.

  • Ọ̀ọ mgbe niile ka iwe iwe dị njọ?

  • Olee mgbe iwe iwe dị njọ?

  • Olee ihe i nwere ike ime ka ị ghara ịna-ewekarị iwe?

  • Amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara iwe

Ọ̀ọ mgbe niile ka iwe iwe dị njọ?

Mba. E nwere ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ wee iwe. Dị ka ihe atụ, ezigbo “iwe were” ohu Chineke bụ́ Nehemaya mgbe ọ nụrụ na a na-echi ụfọdụ ndị ya na ha so na-efe Jehova ọnụ n’ala.​—Nehemaya 5:6.

Mgbe ụfọdụ, Chineke na-ewe iwe. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ohu Chineke n’oge ochie kwụsịrị ife ya ma malite ife chi ụgha, ‘Jehova wesoro ha iwe dị ọkụ.’ (Ndị Ikpe 2:​13, 14) N’agbanyeghị na e nwere mgbe Jehova were iwe, e jighị iwe mara ya. Ọ na-ewe iwe naanị mgbe e nwere ezigbo ihe kpatara ya, ọ naghịkwa ewefe ya ókè.​—Ọpụpụ 34:6; Aịzaya 48:9.

Olee mgbe iwe iwe dị njọ?

Iwe dị njọ ma ọ bụrụ iwe ọkụ, ma ọ bụkwanụ nke na-enweghị isi. Ọ bụ ụdị iwe a ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ewekarị. Dị ka ihe atụ:

  • Ken ‘were iwe dị ọkụ’ mgbe Chineke na-anabataghị àjà ọ chụrụ. Ken wegidere iwe ruo na nke igbu nwanne ya.​—Jenesis 4:​3-8.

  • Jona onye amụma ‘were iwe dị ọkụ’ mgbe Chineke meere ndị Ninive ebere. Chineke gbaziri Jona, gwa ya na ‘iwe ọkụ ọ na-ewe ezighị ezi,’ na o kwesịrị imere ndị mmehie ahụ chegharịrị echegharị ebere.​—Jona 3:10–4:​1, 4, 11.a

Ihe atụ ndị a gosiri na ‘iwe mmadụ na-ezughị okè na-ewe anaghị arụpụta ezi omume Chineke.’​—Jems 1:20.

Olee ihe i nwere ike ime ka ị ghara ịna-ewekarị iwe?

  • Ghọta nsogbu iwe ọkụ nwere ike ịkpata. Ụfọdụ ndị chere na ọ bụrụ na ha ewee iwe ọkụ, na ọ na-egosi na ha dị ike. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-ewekarị iwe ọkụ nwere ezigbo nsogbu. “Dị ka obodo e tidara etida nke na-enweghị mgbidi, otú ahụ ka onye na-adịghị ejide mmụọ ya dị.” (Ilu 25:28) Ma, ọ bụrụ na anyị na-ejideli onwe anyị ma a kpasuo anyị iwe, o gosịrị na anyị bụ dimkpa, marakwa ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike.”​—Ilu 16:32.

  • Chịkwaa iwe gị tupu ya emee ka i mee ihe ị ga-akwara mmakwaara. Abụ Ọma 37:8 kwuru sị: “Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma; ewela iwe naanị iji mee ihe ọjọọ.” Ị chọpụtara na e nwere ihe anyị nwere ike ime ma a kpasuo anyị iwe? Ndị Efesọs kwuru, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela.”

  • A kpasuo gị iwe, o kwe omume, si ebe ahụ pụọ tupu iwe gị aka njọ. Baịbụl kwuru, sị: “Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ; ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.” (Ilu 17:14) Ọ bụ eziokwu na ọ dị mma idozi esemeokwu ngwa ngwa, gị na onye gị na ya na-ese okwu kwesịrị ibugodị ụzọ kwọsa obi unu mmiri tupu unu enwee ike imeda obi kwurịta nsogbu ahụ.

  • Mata otú ihe si mee. Ilu 19:11 kwuru, sị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” Ọ ga-akacha mma ịma kpọmkwem otú ihe si mee tupu anyị ewewe iwe. Ọ bụrụ na anyị egee ntị nke ọma mata otú niile ihe si mee, o nwere ike ime ka anyị ghara iwewe iwe na-enweghị isi​—Jems 1:​19.

  • Kpee ekpere maka udo nke obi. Ekpere nwere ike inyere gị aka inweta “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Ndị Filipaị 4:7) Ekpere bụ otu n’ime ụzọ a kacha esi enweta mmụọ nsọ, bụ́kwanụ ihe nwere ike ime ka anyị nwee àgwà ndị dị ka udo, ndidi, na njide onwe onye.​—Luk 11:13; Ndị Galeshia 5:​22, 23.

  • Saa anya na mmiri họrọ ndị gị na ha ga na-akpa. Anyị na-akpakarị àgwà otú ndị enyi anyị si akpa. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji dọọ anyị aka na ntị. Ọ sịrị: “Abụla enyi onye ọ bụla nke na-ewekarị iwe; gị na onye na-ewe iwe ọkụ akpakọrịtala.” Maka gịnị? “Ka ị ghara ịmụta ụzọ ya wee wetara mkpụrụ obi gị ọnyà.”​—Ilu 22:​24, 25.

Amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara iwe

Ilu 16:32: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike.”

Ihe ọ pụtara: Ọ bụrụ na ị na-ejideli onwe gị ma a kpasuo gị iwe, ọ na-egosi na ị bụ dimkpa.

Ilu 17:14: “Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ; ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.”

Ihe ọ pụtara: Iwe bịawa gị, si ebe ahụ pụo

Ilu 19:11: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.”

Ihe ọ pụtara: Anyị agaghị na-ewe iwe na-enweghị isi ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ chọpụta otú ihe si mee kama ibu ụzọ jiri iwe mee ihe tupu anyị amara kpọmkwem otú ihe si mee.

Ilu 22:​24, 25: “Abụla enyi onye ọ bụla nke na-ewekarị iwe; gị na onye na-ewe iwe ọkụ akpakọrịtala, ka ị ghara ịmụta ụzọ ya.”

Ihe ọ pụtara: Ọ bụrụ na anyị na ndị na-ewekarị iwe ana-akpa, anyị nwere ike ịna-eme ka ha.

Ilu 29:11: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị.”

Ihe ọ pụtara: Anyị kwesịrị ịna-ejide onwe anyị ma a kpasuo anyị iwe kama ịna-ewekari iwe.

Ndị Galeshia 5:​22, 23: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.”

Ihe ọ pụtara: Mmụọ nsọ nwere ike inyere anyị aka inwe àgwà ndị ga-eme ka anyị ghara ịna-ewekarị iwe.

Ndị Efesọs 4:26: “Weenụ iwe, ma unu emehiela.”

Ihe ọ pụtara: O nweghị otú anyị ga-esi kwụsịchaa ịna-ewe iwe, mana, anyị nwere ike ịna-ejide onwe anyị ma a kpasuo anyị iwe ma ọ bụkwanụ ghara ịna-ewekarị iwe.

Jems 1:19: “Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.”

Ihe ọ pụtara: Ọ bụrụ na anyị ana-ege ntị nke ọma, o nwere ike inyere anyị aka ịghara ịna-ewe iwe ngwa ngwa.

a O doro anya na Jona nabatara mgbazi ahụ ma kwụsị iwe iwe. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na Chineke ji ya dee akwụkwọ Baịbụl ahụ a kpọrọ aha ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya