Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 162
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Olee mgbe ndụ mmadụ na-amalite?
  • Chineke ọ̀ ga-agbaghara onye terela ime?
  • Ọ bụrụ na ndụ nne ma ọ bụ nwa e bu n’afọ nọ n’ihe ize ndụ, o nwere ihe o mere ma o tee ime ahụ?
  • Ite Ime
    Teta!—2017
  • Ite Ime Abụghị Ebe Okwu Biri
    Teta!—2009
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ndụ Chineke Nyere Gị
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 162
Ebe nwaanyị dị ime na-ele onwe ya n’enyo

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl ekwughị gbasara “ite ime” nke mmadụ ịma ama wepụ nwa nọ ya n’afọ. Ma, e nwere ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru gbasara otú Chineke si ele ndụ mmadụ anya, ma nke nwa e bu n’afọ.

Ndụ bụ onyinye si n’aka Chineke. (Jenesis 9:6; Abụ Ọma 36:9) O weere ndụ mmadụ niile ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ma nke nwa e bu n’afọ. Ọ bụ ya mere na mmadụ kpachara anya gbuo nwa nọ n’afọ, a na-ewere onye ahụ ka onye gburu ọchụ.

Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-alụ ọgụ, ha ewee merụọ nwaanyị dị ime ahụ́, nwa ya ewee pụta ma mmadụ anwụghị n’ihe mberede a, a ghaghị iri ya iwu dị ka ihe onye lụ nwaanyị ahụ gwara ya si dị; ọ ga-akwụkwa ya site n’aka ndị ikpe. Ma ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’ihe mberede a, ị ga-eme ka mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi.”—Ọpụpụ 21:22, 23.a

  • Olee mgbe ndụ na-amalite?

  • Chineke ọ̀ ga-agbaghara onye terela ime?

  • Ọ bụrụ na ndụ nne ma ọ bụ nwa e bu n’afọ nọ n’ihe ize ndụ, o nwere ihe o mere ma o tee ime ahụ?

Olee mgbe ndụ mmadụ na-amalite?

Chineke weere ya na ndụ na-amalite ozugbo nwaanyị tụụrụ ime. N’Okwu ya bụ́ Baịbụl, Chineke kwuru ọtụtụ mgbe na nwa e bu n’afọ bụ mmadụ. Ka anyị lee ihe atụ ụfọdụ na-egosi na Chineke anaghị ewere ya na nwa e bu n’afọ dị iche na nke a mụrụla amụ.

  • Eze Devid si n’ike mmụọ nsọ gwa Chineke, sị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ.” (Abụ Ọma 139:16) Chineke weere Devid ka mmadụ dị ndụ tupudị a mụọ ya.

  • Ihe ọzọkwa bụ na tupudị a mụọ Jeremaya onye amụma, Chineke ma na o nwere ọrụ pụrụ iche ọ ga-arụrụ ya. Chineke gwara ya, sị: “Tupu mụ akpụọ gị n’ime afọ, amaara m gị, tupu gị esi n’akpa nwa pụta, edoro m gị nsọ. Emere m gị onye amụma nke mba dị iche iche.”—Jeremaya 1:5.

  • Luk onye so dee Baịbụl, onye bụ́kwanụ dọkịta, ji otu okwu Grik o ji kọwaa nwa e bu n’afọ kọwaa nwa a mụrụ ọhụrụ.—Luk 1:41; 2:12, 16.

Chineke ọ̀ ga-agbaghara onye terela ime?

Chineke nwere ike ịgbaghara ndị tetụrụla afọ ime. Ọ bụrụ na ha amalite ile ndụ anya otú Chineke si ele ya, ha ekwesịghị ichewe na ndụ a ha dị enweghị isi. “Jehovah dị ebere na-emekwa amara. . . Dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka o mere ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ.”b (Abụ Ọma 103:8-12) Jehova ga-agbaghara ndị niile ji obi ha chegharịa ná mmehie ndị ha mere, ma ndị nke terela ime.—Abụ Ọma 86:5.

Ọ bụrụ na ndụ nne ma ọ bụ nwa e bu n’afọ nọ n’ihe ize ndụ, o nwere ihe o mere ma o tee ime ahụ?

N’ihi ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara nwa e bu n’afọ, mmadụ ekwesịghị ite ime n’ihi na a gwara ya na nwa e bu n’afọ ma ọ bụ yanwa nwere ike ịnwụ ma a hapụ ime ahụ.

Ọ bụ eziokwu na ọ naghị emekarị, gịnịkwanụ ka a ga-eme ma ọ bụrụ na mgbe a na-amụ nwa e nwee nsogbu biliterenụ nke ga-eme ka ọ dị mkpa ikpebi ichebe ndụ nne ma ọ bụ nke nwa o bu n’afọ? A bịa na nke a, ndị ọ gbasara ga-eji aka ha ekpebi ndụ onye nke a ga-echebe.

a Otú e si sụgharịa iwu a na Baịbụl ụfọdụ bịaziri mee ka o yie ka ebe nsogbu dị bụ ma ihe mee nwaanyị ahụ dị ime, ọ bụghị nwa o bu n’afọ. Ma, okwu Hibru e si na ya sụgharịa ihe a gosiri na ihe a na-ekwu okwu ya bụ ma nwaanyị ahụ dị ime ma ọ bụ nwa o bu n’afọ nwụọ.

b Jehova bụ aha Chineke, e kwukwara gbasara aha a na Baịbụl.—Abụ Ọma 83:18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya