Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwex isiokwu 1
  • “M Na-eme Ike M Niile”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “M Na-eme Ike M Niile”
  • Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ọsọ Enyemaka Anyị Na-agbatara Ụmụnna Anyị Si Baara Ụmụnna Nọ n’Agwaetiti Karịbian Uru
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • “Ọ Dịtụbeghị Mgbe E Gosiri M Ụdị Ịhụnanya A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
ijwex isiokwu 1
Ebe Irma na-ede akwụkwọ ozi

“M Na-eme Ike M Niile”

Irma, onye bi na Jamani, afọla obere ka o ruo afọ iri itoolu. Mgbe o nwechara nnukwu ihe mberede ugboro abụọ, a waakwa ya ahụ́ ọtụtụ ugboro, o nwelizighị ike ịga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otú Irma sizi ezi ozi ọma ugbu a bụ ide akwụkwọ ozi o ji agba ndị mmadụ ume, na nke o ji akasi ndị mmadụ nwụnahụrụ obi. Akwụkwọ ozi Irma na-ede na-amasị ndị mmadụ nke mere na ọtụtụ ndị na-akpọkarị ya n’ekwentị na-ajụ ya mgbe ọzọ akwụkwọ ozi ya ga-abịa. Ọtụtụ ndị detakwaara ya akwụkwọ ozi iji kelee ya ma rịọ ya ka o detara ha akwụkwọ ozi ọzọ. Irma kwuru, sị: “Ihe a niile na-eme m obi ụtọ, na-emekwa ka okwukwe m sie ike.”

Irma

Irma na-edegakwara ndị nọ n’ebe a na-elekọta ndị ahụ́ na-esighị ike akwụkwọ ozi. O kwuru, sị: “Otu nwaanyị merela agadi kpọrọ m ma kwuo na akwụkwọ ozi m detaara ya mgbe di ya nwụrụ kasiri ya obi. O tinyere akwụkwọ ozi ahụ na Baịbụl ya ma na-agụ ya n’uhuruchi. Nwaanyị ọzọ di ya nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya kwuru na akwụkwọ ozi m enyerela ya aka karịa okwuchukwu ụkọchukwu ha kwuru. O nwere ọtụtụ ajụjụ ọ ga-ajụ. Ọ jụrụ m ma ya nwere ike ịbịa na nke m.”

Otu enyi Irma na-abụghị Onyeàmà Jehova kwagara ebe ọzọ dịtụ anya. Ọ gwara Irma ka ọ na-edetara ya akwụkwọ ozi. Irma kwuru, sị: “Nwaanyị a dewere akwụkwọ ozi niile m degaara ya. Mgbe ọ nwụrụ, nwa ya nwaanyị kpọrọ m n’ekwentị. Ọ gwara m na ya agụọla akwụkwọ ozi niile m deere mama ya ma rịọ m ma m̀ nwere ike ịna-edetakwara yanwa ụdị akwụkwọ ozi a e ji akụzi Baịbụl.”

Ozi ọma Irma si otú a ekwusa na-atọ ya ụtọ. Ọ sịrị: “M na-arịọ Jehova ka o nye m ike m ga-eji na-ejere ya ozi. Ọ bụ eziokwu na m naghị agalizi site n’ụlọ ruo n’ụlọ, m na-eme ihe m nwere ike ime.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya