Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwhf isiokwu 8
  • Otú Ị Ga-esi Na-enwekwu Ndidi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Na-enwekwu Ndidi
  • Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị mere i ji kwesị ịna-enwe ndidi?
  • Olee otú ị ga-esi na-enwe ndidi?
  • Ndidi Dị Anyị Mkpa n’Ozi Anyị
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Na-enwe Ndidi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ṅomie Ndidi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ị̀ Pụrụ Inwe Ndidi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
ijwhf isiokwu 8
Ebe otu nwaanyị na-ele akpụkpọ ụkwụ ọ chọrọ ịzụ, di ya ejiri iwe na-echere ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE

Otú Ị Ga-esi Na-enwekwu Ndidi

“Otú di na nwunye si emeso ibe ha ihe kwa ụbọchị nwere ike ime ka a mata ma hà na-enwere ibe ha ndidi. O nwere ike ịbụ na inwe ndidi adịchaghị gị mkpa mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwaanyị. Ma ọ dị ezigbo mkpa iji mee ka di na nwunye na-ebi nke ọma.”​—John.

  • Gịnị mere i ji kwesị ịna-enwe ndidi?

  • Olee otú ị ga-esi na-enwe ndidi?

  • “Inwe ndidi dị ezigbo mkpa”

Gịnị mere i ji kwesị ịna-enwe ndidi?

  • Mgbe unu lụrụ, unu ga-abịa mata onwe unu nke ọma nke na i nwere ike ịhụkwu ebe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-anaghị emecha nke ọma.

    “Mgbe oge ụfọdụ unu lụrụ gachara, ọ na-adị mfe ilekwasị anya n’àgwà ndị ahụ na-anaghị amasị gị di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpa. I mewe otú ahụ, ọ ga-adịrị gị mfe ịghara ịna-enwezi ndidi.”​—Jessena.

  • Enweghị ndidi nwere ike ime ka i kwuo okwu n’echeghị echiche.

    “M na-adị ngwa ikwu ihe dị m n’obi nke na mgbe ụfọdụ, m na-ekwu ihe m na-ekwesịghị ikwu. Ọ bụrụ na m na-enwekwu ndidi, m ga-ebu ụzọ chee ma ihe m chọrọ ikwu ọ̀ dị ezigbo mkpa. O nwekwara ike ime ka m kpebie na ọ dịghị mkpa.”​—Carmen.

    Baịbụl kwuru, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma.” (1 Ndị Kọrịnt 13:4) Ọ dị mma ka mmadụ abụọ hụrụ ibe ha n’anya na-enwere ibe ha ndidi. Ma ọ naghị adị otú ahụ mgbe niile. John e kwuru okwu ya ná mmalite kwuru, sị: “Inwekwu ndidi na-esi ike, ma ị ghara inwekwu ndidi anaghị esi ike. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’àgwà ndị ọzọ. Mmadụ ga-agbasi mbọ ike tupu ya ana-enwekwu ndidi.”

Olee otú ị ga-esi na-enwe ndidi?

  • Mgbe ihe mberede mere, ya esiere gị ike inwe ndidi.

    Ihe atụ: Mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị gwara gị okwu ọjọọ, ya adị ka ọ̀ bụ gị gwagwara ya.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe, n’ihi na iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.”​—Ek 7:9.

    Otú ị ga-esi na-enwe ndidi: Cheretụ. Tupu gị agwa ya okwu, gwa onwe gị na ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị bu n’obi kwuo okwu ahụ abụghị ka ọ kpasuo gị iwe ma ọ bụ kparịa gị. Otu akwụkwọ aha ya bụ Fighting for Your Marriage, kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime anyị na-agbakwasịkarị ụkwụ n’ihe anyị chere di anyị ma ọ bụ nwunye anyị bu n’obi kwuo okwu meso ya ihe karịa n’ihe yanwa bu n’obi kwuo ihe o kwuru.”

    Ebe otu nwoke gwagwaara nwaanyị ya okwu ọjọọ ọ gwara ya, ya emee ka ihe ka njọ, nakwa ebe otu nwoke jidere onwe ya mgbe nwunye ya kpasuru ya iwe, ya emee ka udo dịrị

    Ọ bụrụgodị na di gị ma ọ bụ nwunye gị chọrọ ịkpasu gị iwe, i nwere ike ime ka udo dị ma ọ bụrụ na ịna-enwe ndidi ma ghara ịchọ ka ị gwagwara ya ihe ọ gwara gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ.”​—Ilu 26:20.

    “Ọ bụrụ na ọ dịwa gị ka nwunye gị ọ̀ bụzi onye iro gị, kwụsị ma chee ihe mere i ji hụ ya n’anya, ma gbalịa meere ya ihe ọma ozugbo.”​—Ethan.

    Ihe ị ga-echebara echiche:

    • Olee ihe ị na-eme ma di gị ma ọ bụ nwunye gị gwa gị okwu ọjọọ ma ọ bụ mee gị ihe na-adịghị mma?

    • Olee otú ị ga-esi na-enwekwu ndidi mgbe ọzọ o mere gị ụdị ihe ahụ?

  • Mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme gị otu ihe na-ewe gị iwe ugboro ugboro.

    Ihe atụ: Di gị ma ọ bụ nwunye gị na-egbukarị oge, ya ana-eme ka obi na-ajọ gị njọ ka ị na-eche ya.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam.”​—Ndị Kọlọsi 3:13.

    Otú ị ga-esi na-enwe ndidi: Na-ebute adịm ná mma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ụzọ karịa ihe ga-abara naanị gị uru. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na ihe a emee ka mụ na ya see okwu, ọ̀ ga-akpa alụmdi na nwunye anyị aka ọjọọ?’ Chetakwa na “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Nke a pụtara na e nwekwara ebe ndị ị ga-arụ ọrụ na ha.

    “Mgbe ụfọdụ, m na-enwere enyi m ndidi karịa ka m na-enwere di m. Echere m na ihe kpatara ya bụ na mụ na di m na-anọkarị mụ ana-ahụ ebe ndị ọ na-anaghị emecha nke ọma. Ma ọ bụrụ na m na-enwere ya ndidi, m na-egosi na m hụrụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. N’ihi ya, inwe ndidi dị ezigbo mkpa n’alụmdi na nwunye m.”​—Nia.

    Ihe ị ga-echebara echiche:

    • Ì na-enwere di gị ma ọ bụ nwunye gị ndidi n’ebe ndị ọ na-anaghị eme nke ọma?

    • Olee otú ị ga-esi na-enwekwuru ya ndidi n’ọdịnihu?

“Inwe ndidi dị ezigbo mkpa”

Jessena na Hayden di ya

“Ka di na nwunye nwee ike ịna-ebi n’udo, ha kwesịrị ịna-enwere ibe ha ndidi. Ebe ọ bụ na unu abụọ ezughị okè, unu ga na-enwe nsogbu dị iche iche si n’oge ruo n’oge. Àgwà ndị marala di gị ma ọ bụ nwunye gị ahụ́ nwedịrị ike ịna-akpasu gị iwe. Ọ bụrụ na ị naghị enwe ndidi, nsogbu ndị ahụ nwere ike iji nwayọọ nwayọọ kpaa adị ná mma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị aka ọjọọ nke na o nwere ike ime ka unu tisaa.” Ihe Jessena na Hayden di ya kwuru.

Ịchịkọta ihe ndị e kwuru n’isiokwu a: Otú ị ga-esi na-enwere di gị ma ọ bụ nwunye gị ndidi

Mgbe ihe mberede mere, ya esiere gị ike inwe ndidi

Tupu gị azaghachi, were ya na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwu ihe ọzọ, ọ bụghị na ọ chọrọ ịkpasu gị iwe.

Mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme gị otu ihe na-ewe gị iwe ugboro ugboro

Na-ebute adịm ná mma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ụzọ karịa ihe ga-abara naanị gị uru. Chetakwa na e nwekwara ebe ndị ị ga-arụ ọrụ na ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya