Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwwd isiokwu 6
  • Otú Nkịta Si Anụ Ísì Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Nkịta Si Anụ Ísì Ihe
  • È Kere Ya Eke?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Bụ Anụ E Ji Mere Enyi nke A Hụrụ n’Anya Ka Ọ̀ Bụ Ajọ Ogbu Ọchụ?
    Teta!—2002
  • Nkịta M Na-anụchitere M Ihe!
    Teta!—1999
È Kere Ya Eke?
ijwwd isiokwu 6
Imi nkịta

È KERE YA EKE?

Otú Nkịta Si Anụ Ísì Ihe

Ndị na-eme nchọpụta kwuru na nkịta na-eji imi ha amata ihe ụfọdụ gbasara nkịta ndị ọzọ. Dị ka afọ ndụ ha, otú obi dị ha nakwa ma hà bụ oké ma ọ bụ nne. E nwedịrị ike ịzụ nkịta ịna-achọpụta ebe bọmbụ ma ọ bụ ọgwụ ike dị. Ndị mmadụ na-ejikarị anya ha achọpụta ihe ndị na-eme gburugburu ha, ma nkịta na-eji imi ha. E nwere ike ikwu na ha na-eji imi ha ahụ ụzọ.

Ihe ị ga-echebara echiche: Otú nkịta si anụ ísì karịrị nke mmadụ okpukpu okpukpu. Otu ụlọ ọrụ dị n’Amerịka kwuru na nkịta nwere ike ịchọpụta na e tinyere ihe dị ka nnu ma ọ bụ shuga dị ezigbo obere na nnukwu mmiri. Dị ka ihe atụ, e tinye shuga na ngaji e ji e nye nwatakịrị mmiri, kee ya ụzọ anọ ma wụnye otu ụzọ n’ebe a na-egwu mmiri, nkịta ga-achọpụta na shuga dị ná mmiri ahụ.

Gịnị mere otú nkịta si anụ ísì ji kara nke mmadụ mma?

  • Imi nkịta na-adị mmiri mmiri, nke a na-eme ka o nwee ike ịna-anụ ísì ụmụ irighiri ihe.

  • E nwere oghere abụọ dị n’imi nkịta. Otu bụ maka iku ume, nke ọzọ abụrụ maka ịnụ ísì. Nkịta maa ihe imi, ikuku na-abanye n’akụkụ imi ya nwere ihe ndị na-eme ka ọ na-anụ ísì.

  • Ebe nkịta ji anụ ísì n’imi ya karịrị nke mmadụ

  • Ihe ndị yiri akwara dị n’imi nkịta o ji anụ ísì ji okpukpu iri ise karịa nke mmadụ.

Ihe ndị a niile na-enyere nkịta aka ịchọpụta ihe dị iche iche dị n’otu ísì ọ nụrụ. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịnụ ísì ofe, ma ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na nkịta nụ ya, o nwere ike ịmata ihe niile e ji sie ofe ahụ.

Ebe e senyere efere ofe n’isi mmadụ ma senye ihe niile e ji sie ofe ahụ n’isi nkịta

Ndị na-eme nchọpụta n’otu ụlọ ọrụ na-eme nchọpụta gbasara ọrịa kansa kwuru na imi nkịta na ụbụrụ ya na-arụkọ ọrụ ọnụ. Nke a mere ka ha bụrụ “otu n’ime ihe kacha mma e nwere n’ụwa e ji anụ ísì ihe.” N’ihi ya, ndị sayensị na-emepụta ngwá ọrụ elektrọnik ga na-anụ ísì ha ga-eji na-achọpụta bọmbụ, ahịa iwu, nakwa ọrịa, dị ka kansa.

Gịnị ka i chere? Otú nkịta si anụ ísì ihe, ọ̀ nọkatara dịrị? Ka è kere ya eke?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya