Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbv isiokwu 27
  • Jenesis 1:26—“Ka Anyị Kee Mmadụ n’Oyiyi Anyị”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jenesis 1:26—“Ka Anyị Kee Mmadụ n’Oyiyi Anyị”
  • Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jenesis 1:26 Pụtara
  • Ihe Ndị Gbara Jenesis 1:26 Gburugburu
  • Ihe Ndị Na-abụghị Eziokwu Gbasara Jenesis 1:26
  • Ụmụ Anụmanụ
    Teta!—2015
  • Jenesis 1:1—‘Na mbụ, Chineke Kere Eluigwe na Ụwa’
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Ndụ Nwere Nzube Dị Ebube
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Olee Otú Ihe Ndị Dị Ndụ Si Malite Ịdị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
ijwbv isiokwu 27

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Jenesis 1:26​—“Ka Anyị Kee Mmadụ n’Oyiyi Anyị”

“Chineke wee sị: ‘Ka anyị kee mmadụ n’oyiyi anyị, ka ha dị ka anyị. Ka azụ̀ ndị juru n’oké osimiri na anụ ndị na-efegharị n’eluigwe na anụ ụlọ na anụ niile na-arị arị nọrọ n’okpuru ha, ka ha na-elekọtakwa ụwa niile.’”​—Jenesis 1:26, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

“Chineke wee sị, ‘Ka anyị kpua mmadụ n’onyinyo anyị, dị ka oyiyi anyị si dị; ka ha nweekwa ike n’ahụ́ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ́ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ́ anụ ụlọ, na n’ahụ́ ụwa niile, na n’ahụ́ ihe niile ọ bụla na-akpụ akpụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.’”​—Jenesis 1:26, Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe Jenesis 1:26 Pụtara

E kere mmadụ n’oyiyi Chineke, nke pụtara na mmadụ nwere ike inwe ụdị àgwà ndị Chineke nwere, na-akpakwa àgwà ndị ahụ, dị ka ịhụnanya, obi ebere, na ikpe ikpe ziri ezi. Ọ bụ ya mere na ụmụ mmadụ ga-eṅomili àgwà ndị Chineke nwere.

“Chineke wee sị: ‘Ka anyị kee mmadụ n’oyiyi anyị.’” Tupu Jehova Chinekea ekee onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ, o bu ụzọ kee otu mmụọ ozi siri ike, onye e mechara kpọwa Jizọs. O si n’aka Jizọs, “kee ihe ndị ọzọ niile dị ma n’eluigwe ma n’ụwa.” (Ndị Kọlọsi 1:16) Jizọs na-akpa àgwà ka Jehova. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na Jizọs “yiri Chineke, onye a na-enweghị ike ịhụ anya.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Ọ bụ ya mere o ji daba adaba na Chineke gwara Jizọs, sị: “Ka anyị kee mmadụ n’oyiyi anyị.”

“Ka . . . anụ ụlọ . . . nọrọ n’okpuru ha, ka ha na-elekọtakwa ụwa niile.” E keghị ụmụ anụmanụ n’oyiyi Chineke. E keghị ha ka ha na-akpa àgwà e ji mara mmadụ dị ka ịhụnanya, e keghịkwa ha ka ha nwee akọnuche. Ma, Chineke na-elekọta ụmụ anụmanụ ndị a o kere. Ọ bụ ya mere o ji kwuo na ụmụ anụmanụ ga-anọ “n’okpuru” mmadụ. Ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ịnọ n’okpuru mmadụ bụ, ‘mmadụ ga-enwe ike n’ahụ́ ha’ (Bible Nsọ nke Union Version) ma ọ bụkwanụ ka mmadụ ‘nwee ike ọchịchị n’ebe ha nọ’ (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik). Jehova si otú ahụ nye ụmụ mmadụ ọrụ ilekọta ụmụ anụmanụ. (Abụ Ọma 8:6-8; Ilu 12:10) Jehova chọrọ ka ụmụ mmadụ lekọta ụwa na ihe ndị dị ndụ dị na ya nke ọma.

Ihe Ndị Gbara Jenesis 1:26 Gburugburu

Jenesis isi nke mbụ na nke abụọ kọwara otú e si kee eluigwe na ụwa, nakwa otú ndụ si malite n’ụwa. Ihe niile Jehova kere dị ịtụnanya, ma, ọ bụ ụmụ mmadụ kacha pụọ iche n’ihe niile e kere eke n’ụwa. Mgbe Chineke kechara ihe, o “lere ihe niile o kere wee hụ na ha dị nnọọ mma.”​—Jenesis 1:31.

Lee obere vidio a ka ị matakwuo banyere ihe e kwuru n’akwụkwọ Jenesis gbasara otú e si kee ihe.

Ihe Ndị Na-abụghị Eziokwu Gbasara Jenesis 1:26

Ụgha: Chineke nwere ụdị ahụ́ anyị nwere.

Eziokwu: “Chineke bụ Mmụọ,” ya bụ na ọ dịghị ka anyị, o nweghị ụdị ahụ́ anyị nwere. (Jọn 4:24) Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, Baịbụl na-ekwu banyere aka ya, obi ya, na ihe ndị ọzọ, ihe ndị a bụ ihe atụ́ e ji akụziri anyị banyere Chineke otú mmadụ ga-enwe ike ịghọta ya.​—Ọpụpụ 15:6; 1 Pita 3:12.

Ụgha: Jenesis 1:26 na-egosi na Jizọs bụ Chineke.

Eziokwu: Chineke na Jizọs na-emekọ ihe otú nna na nwa si emekọ ihe, ma ha abụghị otu onye. Jizọs kwuru na Chineke ka ya. (Jọn 14:28) Ị chọọ ịmatakwu gbasara ihe a, lee vidio isiokwu ya bụ Jizọs Kraịst Ọ̀ Bụ Chineke? ma ọ bụ gị agụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke?”

Guọ Jenesis isi nke 1 na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Baịbụl a dị mfe ọgụgụ. O nwere foto, map, ihe ndị e dere n’ala ala peeji, ihe ndị e dere n’etiti peeji, nakwa ihe ndị a kọwakwuru na ya.

Lee obere vidio a ka ị hụ ihe akwụkwọ Jenesis na-ekwu.

a Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya