AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA
Ilu 16:3—“Were Ọrụ Gị Niile Nyefee n’Aka Onyenwe Anyị”
“Tinye ihe ọ bụla ị na-eme n’aka Jehova, ihe ndị ị chọrọ ime ga-agakwa nke ọma.”—Ilu 16:3, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.
“Were ọrụ gị niile nyefee n’aka Onyenwe Anyị, ọ ga-eme ka ha gaa n’ihu.”—Ilu 16:3, Baịbụlụ Nsọ (n’Igbo Ndị Ugbu A).
Ihe Ilu 16:3 Pụtara
Ilu a na-eme ka obi sie ndị na-efe ezi Chineke ike na ihe ndị ha chọrọ ime ga-aga nke ọma ma ha tụkwasị ya obi, na-achọ ka o duzie ha, na-esokwa nduzi ya.
“Tinye ihe ọ bụla ị na-eme n’aka Jehova.” Ndị na-efe Jehovaa chọwa ime mkpebi, ha na-ebu ụzọ weda onwe ha ala rịọ Jehova ka o duzie ha. (Jems 1:5) Ọ̀ bụ maka gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ mgbe, ọ bụghị mmadụ na-ekpebi ihe ga-eme ná ndụ ya. (Ekliziastis 9:11; Jems 4:13-15) Ihe ọzọ kpatara ya bụ na o nwere ike mmadụ agaghị enwe amamihe ga-enyere ya aka ime ihe ndị ọ chọrọ ime. Ọ bụ ihe ndị a mere ọtụtụ ndị ma ihe ji etinye ma ọ bụ enyefe ihe ndị ha chọrọ ime n’aka Chineke. Otú ha si eme ya bụ ikpe ekpere rịọ Chineke ka o duzie ha. Otú ọzọ ha si eme ya bụ ịna-eme uche ya bụ́ nke e dere n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl.—Ilu 3:5, 6; 2 Timoti 3:16, 17.
Otú e si dee “were ọrụ gị niile nyefee n’aka Onyenwe Anyị”b n’asụsụ Hibru bụ “kwagara ONYENWE ANYỊ ọrụ gị.” Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na okwu a na-egosi “ebe mmadụ buuru ibu dị arọ o bu n’azụ na-ebunye onye ka ya ike na onye ga-ebuli ya karịa ya.” Obi kwesịrị isi ndị wedara onwe ha ala ma tụkwasị Chineke obi ike na ọ ga-enyere ha aka ma kwado ha.—Abụ Ọma 37:5; 55:22.
Okwu bụ́ “ihe ọ bụla ị na-eme” apụtaghị na Chineke ga-akwado ihe ọ bụla ndị mmadụ chọrọ ime ma ọ bụ gọzie ya. Ndị chọrọ inweta ngọzi Jehova ga-emerịrị ka ihe ha na-eme daba ná ntụziaka ya nakwa n’uche ya. (Abụ Ọma 127:1; 1 Jọn 5:14) Chineke anaghị agọzi nnupụisi. N’eziokwu, “ọ na-aghasasị atụmatụ ndị ajọ omume.” (Abụ Ọma 146:9) Ma, ọ na-akwado ndị na-edo onwe ha n’okpuru ya ma na-akwanyere iwu ya ndị e dere na Baịbụl ùgwù.—Abụ Ọma 37:23.
“Ihe ndị ị chọrọ ime ga-agakwa nke ọma.” Ụfọdụ Baịbụl sụgharịrị ya ‘atụmatụ gị ga-eguzosi ike.’ N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ochie, okwu a sụgharịrị “ga-eguzosi ike” n’asụsụ Igbo yiri ịtọ ntọala. A na-ejekarị ya egosi otú ihe ndị Chineke kere si sie ike ma ọ bụ kwụsie ike. (Ilu 3:19; Jeremaya 10:12) Otú ahụ ka Chineke ga-emekwa ka ihe ndị ezi omume chọrọ ime nwee isi, mee ka obi na-erukwu ha ala, ka ndụ ha kwụrụ chịm, nakwa ka ha na-enwekwu obi ụtọ.—Abụ Ọma 20:4; Ilu 12:3.
Ihe Ndị Gbara Ilu 16:3 Gburugburu
Ọ bụ Eze Solomọn dere ilu a. Ọ bụkwa ya dere ọtụtụ n’ime ilu ndị dị n’akwụkwọ Ilu. Ọ tụrụ ọtụtụ puku ilu n’ihi amamihe Chineke nyere ya.—1 Ndị Eze 4:29, 32; 10:23, 24.
Ihe Solomọn ji malite Ilu isi nke 16 bụ ito Chineke maka amamihe ya nakwa igosi na Chineke kpọrọ ndị dị mpako asị. (Ilu 16:1-5) Ihe o kwuziri n’amaokwu ndị ọzọ na-eme ka onye gụrụ ha ghọta isi ihe akwụkwọ Ilu na-ekwu, ya bụ, na naanị ihe ga-eme ka mmadụ mara ihe, ihe agaziekwara ya, bụ onye ahụ ịdị umeala n’obi na ikwe ka Chineke na-eduzi ya. (Ilu 16:3, 6-8, 18-23) E kwughachiri eziokwu a gbara ọkpụrụkpụ ọtụtụ ugboro na Baịbụl.—Abụ Ọma 1:1-3; Aịzaya 26:3; Jeremaya 17:7, 8; 1 Jọn 3:22.
Lee vidio a dị nkenke ka ị hụ ihe akwụkwọ Ilu na-ekwu.
a Jehova bụ ezigbo aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”
b Ọtụtụ Baịbụl dere okwu bụ́ “Onyenwe Anyị” (ma ọ bụ “ONYENWE ANYỊ”) kama ide aha Chineke. Ị chọọ ịmata ihe mere e ji mee ihe a na-akpatara ndị mmadụ mgbagwoju anya n’ọtụtụ Baịbụl, gụọ isiokwu bụ́ “Isaiah 42:8—‘I Am the LORD.’” Ọ gbara n’isiokwu bụ́ “Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara” na Bekee.