Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbv isiokwu 60
  • Ilu 17:17—“Enyi Nwere Ịhụnanya Mgbe Niile”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ilu 17:17—“Enyi Nwere Ịhụnanya Mgbe Niile”
  • Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ilu 17:17 Pụtara
  • Ihe Ndị Gbara Ilu 17:17 Gburugburu
  • Otú E Si Sụgharịa Ilu 17:17 ná Nsụgharị Baịbụl Ọzọ
  • M̀ kwesịrị ikwu ihe ọjọọ enyi m mere?
    Teta!—2009
  • Chineke Na-Akpọ Gị Òkù Ịghọ Enyi Ya
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
ijwbv isiokwu 60

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Ilu 17:17—“Enyi Nwere Ịhụnanya Mgbe Niile”

“Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”​—Ilu 17:17, Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

“Enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, nwanne nọ maka igbo mkpa.”​—Ilu 17:17, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe Ilu 17:17 Pụtara

A na-atụkwasị ezigbo enyi obi, ọ naghịkwa agharịpụ enyi ya. Ọ na-akwado enyi ya, na-elekọtakwa ya otú ahụ nwanne na-emere nwanne ya, karịchaa n’oge nsogbu.

“Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya.” Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ na “enyi na-ahụ enyi ya n’anya mgbe niile.” Okwu Hibru asụgharịrị “ịhụnanya” n’ahịrịokwu a apụtaghị naanị otú obi na-adị mmadụ. Kama ọ bụ ụdị ịhụnanya enyi na-esi n’ihe ọ na-eme gosi na ọ hụrụ enyi ya n’anya. (1 Ndị Kọrịnt 13:4-7) Ndị enyi hụrụ ibe ha n’anya otú ahụ anaghị agbasa ma ha nwee nghọtahie ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ. Ha na-ejikwa obi ha niile agbaghara ibe ha. (Ilu 10:12) Ezigbo enyi anaghịkwa enwere enyi ya anyaụfụ ma ihe gaziwere ya. Kama, ọ na-enwe obi ụtọ.​—Ndị Rom 12:15.

“Ezigbo enyi . . . bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.” Ilu a gosiri na ndị bụ́ ụmụnne na-adịkarị n’ezigbo mma. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị emee ike anyị niile iji nyere enyi anyị ihe na-esiri ike aka, anyị na-eme ka nwanne afọ onye ahụ. Nsogbu anaghịkwa eme ka enyi ndị dị ná mma otú a gbasaa. Kama, ha na-adịkwu ná mma maka na ha nwee nsogbu, ha na-abịa hụkwuo ibe ha n’anya, na-akwanyekwuru ibe ha ùgwù.

Ihe Ndị Gbara Ilu 17:17 Gburugburu

Ihe juru n’akwụkwọ Ilu bụ okwu amamihe ndị e dere ná nkenke, ndị na-emekwa ka onye na-agụ ya chee echiche. Ọ bụ Eze Solomọn dere ọtụtụ n’ime ha. O dere ha otú ndị Hibru si ede abụ uri. Kama ide okwu ndị otú e si akpọ ha yiri ibe ha, o dere ihe ndị yiri ibe ha na ihe ndị dị iche n’ibe ha. Mgbe ụfọdụ, ọ na-ede otu ihe iji mesie nke mbụ o dere ike ma ọ bụkwanụ ya edee ihe dị iche n’ihe mbụ o dere. Ilu 17:17 bụ ụdị abụ uri yiri ibe ya, e ji ahịrịokwu nke abụọ mesie ahịrịokwu nke mbụ ike. Ilu 18:24 bụ ụdị nke ihe nke abụọ o dere dị iche n’ihe mbụ o dere. Ebe ahụ sịrị: “E nwere ndị enyi dị njikere ịla ibe ha n’iyi, ma e nwere enyi hụrụ enyi ya n’anya karịa nwanne ya.”

Mgbe Solomọn dere Ilu 17:17, o nwere ike ịbụ na ọ na-eche banyere otú nna ya, bụ́ Devid, na Jonatan, nwa Eze Sọl, si dị n’ezigbo mma. (1 Samuel 13:16; 18:1; 19:1-3; 20:30-34, 41, 42; 23:16-18) N’agbanyeghị na Devid na Jonatan abụghị ụmụnne, ha dị n’ezigbo mma karịadị ụmụnne. Jonatan medịrị ihe gaara ata isi ya iji chebe enyi ya.a

Ebe Jonatan na Devid nọ n’ọnụ ọgba. Jonatan na-agba Devid ume, Devid ana-ege ya ntị.

Otú E Si Sụgharịa Ilu 17:17 ná Nsụgharị Baịbụl Ọzọ

“Na mgbe niile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.”​—Bible Nsọ nke Union Version.

Gụọ Ilu isi 17 na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Baịbụl a dị mfe ọgụgụ. O nwere ebe ndị ị ga-egere egere, foto, map, ihe ndị e dere n’ala ala peeji, ihe ndị e dere n’etiti peeji, nakwa ebe a kọwakwuru ihe ụfọdụ.

Lee obere vidio a ka ị hụ ihe akwụkwọ Ilu na-ekwu.

a Gụọ isiokwu bụ́ “Bound Together in Close Friendship.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya