27 Ọ sịziri ha: “Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị, ‘Ka onye ọ bụla n’ime unu kee mma agha ya n’úkwù. Gagharịakwanụ n’ebe niile unu mara ụlọikwuu, si n’otu ọnụ ụzọ ámá ruo n’ọnụ ụzọ ámá ọzọ. Gbuonụ ụmụnne unu, ndị agbata obi unu, na ezigbo ndị enyi unu.’”+