14 Ha ga-agwakwa ya ndị bi n’ala a. Ndị bi n’ala a anụkwala na gịnwa, bụ́ Jehova, nọnyeere ndị a+ nakwa na ha ahụla gị ihu na ihu.+ Ị bụ Jehova. Ígwé ojii gị dị n’elu isi ha. I ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị.+