31 Mgbe ndị ebo Benjamin pụtara ka ha zute ndị agha ahụ, e si n’obodo ha rapụta ha.+ Ha wee malite igbu ụfọdụ ndị Izrel n’okporo ụzọ otú ha mere n’oge ndị ọzọ, n’okporo ụzọ gara Betel na nke gara Gibia. Ha gburu ihe dị ka ụmụ nwoke Izrel iri atọ n’ebe ahụ.+