13 Ehazaya zigakwara onyeisi ndị agha iri ise nke atọ na ndị agha iri ise na-eso ya. Ma, onyeisi ndị agha iri ise nke a bịara gbuo ikpere n’ala n’ihu Ịlaịja, malite ịrịọ ya ka o meere ya amara. Ọ sịrị ya: “Onye nke ezi Chineke, biko, ka ihe gbasara ndụ mụ na ndị ohu gị iri ise a metụ gị n’obi.