2 Devid wee gwa ndị Izrel niile zukọrọnụ, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, dịkwa Jehova bụ́ Chineke anyị mma, ka anyị zigara ụmụnne anyị fọdụrụ n’Izrel niile ozi, ha na ndị nchụàjà na ndị Livaị nọ n’obodo ha dị iche iche+ nakwa ndị nke nọ n’ala ebe anụmanụ ha na-ata ahịhịa, ka ha bịakwute anyị.