-
2 Ihe E Mere 7:6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Ndị nchụàjà guzo ebe ha na-arụ ọrụ, ha na ndị Livaị ndị ji ngwá egwú e ji abụrụ Jehova abụ.+ (Ọ bụ Eze Devid mere ngwá egwú ndị ahụ ka ha jiri ha na-ekele Jehova, na-asị, “n’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.” Ihe a ka ha na-ekwu mgbe ọ bụla Devid bịara iso ha* eto Chineke.) Ndị nchụàjà nọkwa n’ihu ha na-afụsi opi ike,+ ka ndị Izrel ndị ọzọ niile guzo ọtọ.
-