31 Eze guzo ebe ahụ ṅụọ iyi+ n’ihu Jehova na ya ga na-eso Jehova nakwa na ya ga-eji obi ya niile na mkpụrụ obi ya niile na-edebe iwu ya, na-eme ihe o kwuru, na-esokwa ntụziaka ya.+ O kwukwara na otú ọ ga-esi eme ya bụ ịna-eme ihe e dere n’akwụkwọ ọgbụgba ndụ a.+