22 Ihere mere m ịrịọ eze ka o nye anyị ndị agha na ndị na-agba ịnyịnya ndị ga-echebe anyị n’ụzọ ka ndị iro ghara inweta anyị n’ihi na anyị gwara eze, sị: “Chineke anyị na-anọnyere ndị niile na-achọ ya.+ Ma ọ na-eji ike ya na iwe ya emegide ndị niile na-ahapụ ya.”+