8 E nwere otu onye nọ naanị ya. E nweghị onye ya na ya nọ. O nweghị nwa ma ọ bụ nwanne. Ma ọ na-arụsi ọrụ ike mgbe niile. Akụnụba anaghị eju ya eju.+ Ma ọ̀ na-ajụ onwe ya, sị, ‘Ònye ka m na-arụrụ ọrụ a m na-arụsi ike ma ghara ịna-ekpori ndụ’?+ Ihe a bụkwa ihe efu, bụrụkwa ọrụ ahụhụ.+