2 E nwekwara ihe ọzọ Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru gbasara ndị ọzụzụ atụrụ na-azụ ndị ya. O kwuru, sị: “Unu achụsasịala atụrụ m. Unu na-eme ka ha na-agbasasị. Unu anaghịkwa elekọta ha.”+
Jehova kwukwara, sị, “N’ihi ya, m ga-ata unu ahụhụ maka ihe ọjọọ unu na-eme.”