-
Jeremaya 40:5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Ma tupu Jeremaya ekpebie ma ọ̀ ga-alaghachi, Nebuzaradan sịrị ya: “Laghachikwuru Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan,+ onye eze Babịlọn mere onyeisi obodo ndị dị na Juda. Gị na ya biri n’obodo unu. Ma ọ bụkwanụ, gị agawa ebe ọ bụla ọzọ dị gị mma.”
Onyeisi ndị nche ahụ nyekwara ya nri ọ ga na-eri, nyekwa ya onyinye ma hapụ ya ka ọ lawa.
-