16 Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ahụ ya na ha nọ kpọọrọ ndị ọzọ niile si Mizpa, bụ́ ndị ha napụtara n’aka Ishmel nwa Netanaya mgbe o gbuchara Gedalaya+ nwa Ahaịkam. Ha kpọghachiri ha Gibiọn, ma ndị dimkpa ma ndị agha ma ụmụ nwaanyị ma ụmụntakịrị ma ndị na-eje ozi n’obí eze.