25 Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Unu na ndị nwunye unu kwere nkwa, mezuokwa ya. Unu sịrị: “Anyị ga-emezurịrị nkwa anyị kwere na anyị ga-achụrụ Eze Nwaanyị nke Eluigwe àjà mmanya na àjà ndị ọzọ.”+ Unu na ndị nwunye unu ga-emezurịrị nkwa unu kwere.’