9 Ndị unu a na-egbughị ga-echeta m ná mba niile a dọọrọ ha n’agha laa.+ Ha ga-aghọta na ezigbo iwe ji m maka na ha hapụrụ m, gbakụta m azụ,+ na-achọkwa ka ha na arụsị ha niile na-asọ oyi kwaa iko.+ Ihere onwe ha ga-eme ha n’ihi ihe ọjọọ niile ha mere nakwa n’ihi arụ niile ha kpara.+