27 N’ụbọchị ị ga-ada, ihe niile i nwere ga-adakpu n’oké osimiri,+
Ma akụ̀ gị ma ngwongwo gị ma ngwá ahịa gị ma ndị na-arụ ọrụ n’ime gị ma ndị na-akwọ gị
Ma ndị na-arachi oghere ndị dị na gị ma ndị na-erere gị ahịa+ ma ndị niile na-alụrụ gị agha,+
Ya bụ, ndị niile nọ n’ime gị.