3 “N’ihi ya, buo amụma, sị ha, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “E meela ka unu tọgbọrọ chakoo, e sikwa n’akụkụ niile lụso unu agha, nke mere ka ndị fọdụrụ ná mba dị iche iche chọwa ka unu bụrụ nke ha, nke mekwara ka ndị mmadụ jiri ọnụ na-eme unu ihe, na-akọkwa akụkọ ọjọọ banyere unu.+