5 Ahụrụ m mgbidi gbara ụlọ nsọ ahụ gburugburu. Nwoke ahụ jikwa okporo ahịhịa amị e ji atụ̀ ihe nke dị kubit isii n’ogologo (kubit nke ọ bụla bụ otu kubit na otu uhiè ọbụ aka). Ọ malitekwara ịtụ otú ahụ́ ụlọ ahụ hà, tụta igbidi ya otu okporo ahịhịa amị, tụtakwa ogo ya otu okporo ahịhịa amị.