16 E nwekwara windo ndị dị warara ná mpụta karịa otú ha dị n’ime+ n’ụlọ ndị nche ahụ nakwa n’ogidi ha ndị dị n’akụkụ nke ọ bụla n’ọnụ ụzọ ámá ahụ. Windo dịkwa n’akụkụ nke ọ bụla n’ihe ahụ a rụnyere n’ụzọ e si abata. E sekwara nkwụ+ n’ogidi ndị ahụ dị n’akụkụ.