45 “‘Mgbe unu na-eke ala ahụ ka onye ọ bụla nweta nke ya,+ unu ga-ekepụta nke unu ga-enye Jehova. Nke ahụ unu ga-enye ya ga-adị nsọ.+ Ogologo ya ga-adị puku kubit iri abụọ na puku ise (25,000). Obosara ya ga-adị puku kubit iri (10,000).+ Ebe ahụ niile ga-adị nsọ.