2 Mgbe mmanya gbuwere Belshaza, o nyere iwu ka a chịtara ya arịa ọlaedo na arịa ọlaọcha ndị Nebukadneza nna ya bukọọrọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem.+ Eze chọrọ ka ya na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị ya na ndị iko ya nwaanyị na ndị nwunye ya ndị ọzọ jiri ha ṅụọ mmanya.