24 Kpọrọ ụmụ nwoke ndị a gaa ka gị na ha sachaa onwe unu otú iwu kwuru, kwụọkwa ụgwọ ihe niile ọ ga-efu ha, ka e wee kpụọ ha isi. Onye ọ bụla ga-esikwa otú a mara na ihe ahụ ndị mmadụ na-akọ banyere gị abụghị eziokwu, kama na ị na-eme ihe kwesịrị ekwesị, na-edebekwa Iwu Mosis.+