34 N’ihi ya kwa, obi ya anaghị adị otu ebe. Ma, nwaanyị na-alụghị di na nwaanyị na-amaghị nwoke na-eche naanị ihe gbasara Onyenwe anyị,+ n’ihi na ha na-achọ ka ahụ́ ha na uche ha dị nsọ. Ma, nwaanyị lụrụ di na-echegbu onwe ya maka ihe ụwa a, n’ihi na ọ na-achọ ime ihe dị di ya mma.