30 onye nchụàjà+ ga-ahụ ọnyá ahụ; ọ bụrụ na otú ọ dị n’anya gosiri na ọ bara ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, ntutu dị na ya ewee na-acha odo odo, dịrịkwa ole na ole, onye nchụàjà ga-ekwupụta na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị.+ Ọ bụ ekpenta isi ma ọ bụ ekpenta agba.