18 Ị ga-agwakwa ndị Izrel, sị, ‘Doonụ onwe unu nsọ maka echi,+ n’ihi na unu ga-ata anụ, n’ihi na unu akwawo ákwá ná ntị Jehova,+ sị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa, n’ihi na ihe dịịrị anyị mma n’Ijipt?”+ Jehova ga-enye unu anụ, unu ga-atakwa anụ n’ezie.+