25 Ha wee weghara obodo ndị e wusiri ike+ na ala na-eme nri,+ wegharakwa ụlọ ndị jupụtara n’ihe ọma niile,+ olulu mmiri e gwuru egwu,+ ubi vaịn na ubi oliv+ na osisi ndị na-emepụta ihe oriri n’ụba, ha malitekwara iri ihe na iriju afọ+ na ịma abụba+ na inwe ahụ́ ọma n’oké ịdị mma gị.+