Ihe E Dere ná Ngwụcha Isiokwu
^ [1] (paragraf nke 3) Ụfọdụ ụmụnna anyị agaghị na-agachili ọmụmụ ihe anya n’ihi otú ihe si dịrị ha, nke ha na-agaghị agbanweli. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ha na-arịa ọrịa. Obi kwesịrị isi ha ike na Jehova ghọtara ọnọdụ ha, na obi dịkwa ya ezigbo ụtọ maka ihe niile ha na-eme iji na-efe ya. Ndị okenye nwere ike inyere ha aka igere ihe ndị e kwuru n’ọmụmụ ihe. Ha nwere ike ime ka ha sí n’ekwentị gere ya ma ọ bụkwanụ ha etinyere ha ya na teepụ.