Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ihe ndị na-enye folic acid na iron n’ahụ́ bụ imeju, ihe oriri na-adị ná mkpo a na-agbawa agbawa, akwụkwọ nri ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, mkpụrụ ndị a na-etiwa etiwa, na mkpụrụ akụ́kụ́ ndị a gwara ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ́. Iji rie nri ndị nwere iron n’ụba, ọ pụrụ inye aka ịgwakọta ha na ihe ndị na-enye vitamin C, dị ka mkpụrụ osisi ndị a ghọtara ọhụrụ.