Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
e Ịṅụ ọgwụ nyeere ụfọdụ n’ime ndị a aka. Nke a na-agụnye ọgwụ ndị na-akpali anyịnya imepụtakwu insulin, ọgwụ ndị ọzọ na-ebelata ịrị elu nke ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara, ndị ọzọkwa bụ ndị na-ebelata ókè ahụ́ ji ajụ insulin. (Ndị dọkịta adịghị atụkebe aro ka ndị na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ na-aṅụ ọgwụ aṅụ.) Ka ọ dịgodị, a pụghị ịṅụ insulin aṅụ, n’ihi na usoro mgbari nri na-agbari protein a tupu ọ banye n’ọbara. Ma iji insulin agwọ ya ma ịṅụ ọgwụ aṅụ adịghị nke na-eme ka mmega ahụ́ na nri na-edozi ahụ́ gharazie ịdị mkpa.