Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
g Ihe dị ka pasent 90 nke ndị na-arịa ọrịa shuga na-arịa Ụdị nke Abụọ ya. N’oge mbụ, a na-akpọ ya ọrịa shuga nke “na-achọghị insulin” ma ọ bụ ọrịa shuga nke “na-amalite mgbe mmadụ tozuru etozu.” Otú ọ dị, aha ndị a akọwaghị ya kpọmkwem n’ihi na ahụ́ nke ihe ruru pasent 40 nke ndị na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ na-achọ insulin. Ọzọkwa, a na-achọpụta na ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-eto eto—ndị ụfọdụ ha na-erubedịghị ọbụna afọ iri na ụma—na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ.