Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
d Akwụkwọ bụ́ Israel in Egypt na-ekwu, sị: “Echiche ahụ nile nke Mozis ịbụ onye a zụlitere n’obí eze Ijipt yiri akụkọ ifo. Ma nnyocha e mekwuru n’obí eze ahụ n’oge Alaeze Ọhụrụ na-egosi ihe dị iche. Thutmose nke Atọ . . . malitere ịkpọrọ ụmụ ndị ikom nke ndị eze nọ n’ebe ọdịda anyanwụ Eshia, bụ́ ndị nọ n’okpuru ya, bịa n’Ijipt iji kụziere ha ụzọ ndụ ndị Ijipt . . . Ya mere, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom nke ndị eze mba ndị ọzọ n’obí eze Ijipt.”