a N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible na-echetara Ndị Kraịst na okwu ha na ofufe ha nwere njikọ chiri anya. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na o yiri onye ọ bụla ka ya bụ onye nwere ụdị ofufe nke ya ma ọ dịghị achịkwa ire ya, kama na-aga n’ihu na-aghọgbu obi nke ya, ụdị ofufe nke onye a bụ ihe efu.”—Jems 1:26.