Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Ndịàmà Jehova ahụtawo akwụkwọ ahụ dabeere na Bible bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè dị ka ezigbo ihe enyemaka. Nke ọ bụla n’ime isiakwụkwọ 39 ya tụlere ajụjụ na-akpali echiche. Ụfọdụ n’ime isiokwu ndị dị na ya bụ: “Olee Otú M Pụrụ Isi Nweta Ezi Ndị Enyi?” “Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nrụgide Ndị Ọgbọ?” “Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Owu Na-ama M Laa?” “Àdị M Njikere Iyi Oge?” “Gịnị Mere A Ga-eji Jụ Ọgwụ Ọjọọ?” “Olee Banyere Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?”