Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Dị ka otu nnyocha e mere na France gosiri, ohere ndị na-arịa ịba ọcha n’anya, ụdị nke C, bụ́ ndị na-aṅụ oké mmanya nwere ibute ọrịa imeju bụ́ cirrhosis ji okpukpu abụọ karịa nke ndị nke na-adịghị aṅụ oké mmanya nwere ibute ọrịa imeju a. A na-atụ aro ka ndị na-arịa ụdị ịba ọcha n’anya a na-aṅụ mmanya nwa ntịị ma ọ bụ ghara ịṅụ ya chaa chaa.