Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b “Otu omume na-ewu ewu bụ ụmụ nwoke ilebara onwe ha na ọdịdị ahụ́ ha anya gabiga ókè. Nke a emeela ka a ghara ịma ọdịiche dị n’etiti ụmụ nwoke na-eso ụmụ nwoke ibe ha enwe mmekọahụ na ụmụ nwoke na-eso ụmụ nwanyị enwe mmekọahụ. Dị ka otu nwoke si kwuo, nwoke na-ebi ụdị ndụ a nwere ike ịdị na-edina nwoke ibe ya, na-edina nwanyị, ma ọ bụkwanụ na-edina ma nwoke ma nwanyị. Ma ọ̀ na-edina nwoke ma ọ̀ na-edina nwanyị, nke ahụ adịghịzi ihe ọ bụụrụ ya, n’ihi na ọ na-ejizi ahụ́ ya emejụ agụụ mmekọahụ ya, na-ejikwa ihe ndị na-enye ya obi ụtọ edochi anya mmekọahụ.” Otu akwụkwọ kwuru na omume a malitere iwu ewu “mgbe ọnụ ọgụgụ ụmụ nwoke na-edina ụmụ nwoke ibe ha mụbara n’obodo, nakwa mgbe a kwụsịziri ile nwoke idina nwoke ibe ya anya dị ka ihe arụ ma nwewe echiche dị iche banyere ihe bụ́ àgwà e ji mara nwoke n’ezie.”