Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Teta! anaghị ekwu na ọ bụ ebe dị otú a ma ọ bụ ebe dị otú a ka mmadụ kwesịrị ịga denye aha n’Ịntanet, ka ya na ndị ọzọ nwee ike na-akparịta ụka n’ebe ahụ. Ọ naghịkwa ekwu na ebe dị otú a na ebe dị otú a adịghị mma idenye aha. Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ na ihe ha na-eme n’Ịntanet abụghị ihe Baịbụl kpọrọ asị.—1 Timoti 1:5, 19.