Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ndị mmadụ na-asị na onye nwụọ, ya agaa ebe ọzọ gaa dịrị ndụ. Ihe a ha na-ekwu abụghị eziokwu n’ihi na Jizọs sị na onye nwụrụ anwụ dị ka onye na-ehi ụra. Baịbụl kwukwara na onye “nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị,” kama, ọ nọ n’ili na-echere mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29; 11:11-13; Ekliziastis 9:5.