Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Ndị Farisii na-ekwu na ndị e wedara ala, ndị na-amaghị Iwu ahụ, bụ “ndị a bụrụ ọnụ.” (Jọn 7:49) Ha kwuru na mmadụ ekwesịghị ịkụziri ndị dị otú ahụ ihe ma ọ bụ soro ha zụkọọ ahịa ma ọ bụ soro ha rie nri ma ọ bụ soro ha kpee ekpere. Mmadụ ikwe ka otu n’ime ha lụọ nwa ya nwanyị ga-abụ ihe jọgburu onwe ya karịa ịgbahapụ ya nye anụ ọhịa. Ha weere ya na ndị dị otú ahụ e wedara ala esoghị ná ndị ga-enweta olileanya mbilite n’ọnwụ.